Isaiah 61

Afọ ngosi ihuọma Onyenwe anyị

1Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dị nʼahụ m,
nʼihi na Onyenwe anyị eteela m mmanụ
ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye.
O zitela m ịkasị ndị obi ha tiwara etiwa obi,
ikwupụta inwere onwe nye ndị a dọtara nʼagha,
na ntọghapụ site nʼọchịchịrị nye ndị mkpọrọ.
Imeghe anya ndị kpuru ìsì

2O zitere m ikwupụta afọ mgbe Onyenwe anyị ga-eji ihuọma leta ndị mmadụ,
na ụbọchị ịbọ ọbọ nke Chineke anyị.
O zitekwara m ịkasị ndị niile na-eru ụjụ obi,
3na igboro ndị niile na-eru ụjụ na Zayọn ihe na-akpa ha.
O zitere m inye ha okpueze mara mma
nʼọnọdụ ntụ,
inye ha ọṅụ,
nʼọnọdụ ịkwa akwa,
na iyikwasị ha mmụọ otuto
nʼọnọdụ mmụọ ịda mba.
Nʼihi na Chineke akụọla ezi omume nʼime ha,
dịka osisi ook siri ike,
igosi ịma mma Onyenwe anyị.

4Ha ga-ewugharịkwa ebe niile e tikpọrọ etikpọ nʼoge ochie,
doziekwa ebe niile tọgbọrọ nʼefu site nʼoge dị anya;
ha ga-eme ka obodo e tikpọrọ etikpọ dị ọhụrụ,
bụ ebe tọgbọrọrị nʼefu nke ọtụtụ ọgbọ gara aga.
5Ndị ọbịa ga-azụrụ gị igwe ewu na atụrụ unu;
ndị mba ọzọ ga-akọrọ unu ala ubi unu, lekọtakwa ubi vaịnị unu niile.
6A ga-akpọ unu ndị nchụaja Onyenwe anyị,
kpọkwa unu ndị ozi Chineke anyị.
A ga-eji akụ niile si na mba dị iche iche zụọ unu.
Ọ bụkwa akụnụba ha ka unu ga-eji nyaa isi.

7Nʼọnọdụ ihere dịịrị ha ugbu a,
ndị m ga-enweta ngọzị okpukpu abụọ,
nʼọnọdụ nkọcha dịịrị ha
ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe nketa ha nwetara.
Ha ga-enweta okpukpu ihe nketa ala abụọ,
ketakwa ọṅụ nke ga-adịgidere ha ruo mgbe ebighị ebi.

8“Nʼihi na mụ onwe m, Onyenwe anyị, na-ahụ ikpe ziri ezi nʼanya.
Ma ana m akpọ izu ohi na ajọ omume niile asị.
Aga m esite nʼikwesị ntụkwasị obi m kwụghachi ndị m nʼihi ahụhụ ha tara,
mụ na ha ga-agbakwa ndụ ebighị ebi.
9Mkpụrụ ha ga-abụ ndị a ma ama,
a ga-asọpụkwara ha nʼetiti mba niile.
Ndị niile hụrụ ha ga-amata,
kwupụtakwa na ha bụ ndị Onyenwe anyị gọziri.”

10Obi na-atọ m ụtọ nke ukwuu nʼime Onyenwe anyị,
mkpụrụobi m ga-etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke m.
Nʼihi na o werela uwe nzọpụta kpuchie m,
werekwa uwe oke ọṅụ nke ezi omume ya yikwasị m nʼahụ.
Adị m ka nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ, onye na-emezi isi ya ka ọ dịrị ka nke onye nchụaja.
E, adị m ka nwaagbọghọ na-alụ di, nke ji ọla ọma dị iche iche chọọ onwe ya mma.
11Dịka aja dị nʼubi si eme ka ihe a kụrụ nʼubi pupụta,
dịka ubi a gbara ogige si eme ka mkpụrụ ubi too,
otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-esi mee ka ezi omume na otuto
pupụta nʼihu mba niile.
Copyright information for IboBIU